Arsenal na-erute nso ịkwụ £60m ji zụta Aubameyang

Ebe foto si, Getty Images
Arsenal erutela nso inwe nkwekọrịta gbasara isi Borussia Dortmund zụta onye na-enyere Gabon goolu bụ Pierre-Emerick Aubameyang, n'ọnụ ego £60m.
Mana azụmahịa ahụ agaghị enwe isi ruo mgbe Dortmund ga-enweta onye ga-anọchi anya Aubameyang dịka Olivier Giroud nke Arsenal dịka akụkọ si kwuo.
Ha ekwela nwa amadị a ọnụ ugboro abụọ mana ndị Dortmund jụrụ ajụ.
Aubameyang dị afọ iri abụọ na asatọ, gbara bọọlụ na Satụde bụ nke mbụ ya kemgbe ụbọchị iri na isii nke ọnwa Disemba, ka ha na Freiburg sọrọ mpi.

Ebe foto si, Getty Images
Dortmund ekwuola sị na ha dị njikere ire ya "ma ọ bụrụ na ụfọdụ ihe ha chọrọ zuo oke".
Ndị otu Bundesliga a jụrụ ịnara Arsenal £43.64m, bụ ihe ha kwere ọnụ na Wenesday.
Ndị Dortmund kwụsịrị Aubameyang ịgba bọọlụ na asọmpi ha na ndị Wolfsburg n'izu abụọ garaaga maka na ọ bịaghị nzukọ otu ha.
Akpọkwaghị ya gaa ịsọmpi nke ha na Hertha Berlin sọrọ na izu garaaga, maka na ndị ọrụ otu ha kwuru sị na ọdịghị njikere, kama ọ gbazuru nkeji iri itoolu n'ịsọmpi ha na Freiburg.
Arsenal na-atụ anya na Aubameyang ga-anọchite Alexis Sanchez, nke hapụrụ ha gawa Manchester United na mbido Jenụwarị a, n'azụmahịa e ji Henrikh Mkhitaryan gbanwee ya.





























