EFCC: Danladi Umar sịrị mmadu nye ya puku dola ole na ole

Ebe foto si, Getty Images
Mgbe e biputara ya
A kpụrụla onye isi ụlọikpe na-ahụ maka nyocha mmerụaka bụ Danladi Umar ga ụlọikpe.
Ụlọọrụ na-enyocha mmeruụaka na Naijiria bụ EFCC bụ ndị kpe ya na-ulọikpe.
Ha na-ebo Umar ebubo na ọ nara otu onye nwere ikpe mmerụaka ego ruru puku dollas ole na ole.
Nke a abụghị nke mbụ a na-ekpe Umar n' ụlọikpe maka mmerụaka.
Onwebeghị ihe Umar kwuru gbasara ebubo nke a.
Onyeisi ala Naijiria bụ Mohammadu Buhari ekwuola na ya ga kwụsị mmerụaka na Naijiria.
Na akwụkwọ e ji bo Umar, EFCC kwuru na Umar chọrọ ego ruru nde naira ịrị na aka otu nwoke akpọrọ na Rasheed Owolabi Taiwo.

























