Ụmụ Naịjirịa etinyela ọnụ na njem Buhari

Aha nkeananụānụ, Onye ọnụ na-eru n'okwu
Mgbe e biputara ya

Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-ahapụ Abuja taa gawa London dịka dọkinta ya gwara ya bịa maka nyocha ahụike ya.

Nke a na-esote njem o mere n'afọ gara aga ebe ọ fọrọ nwa obere ihe ka ọ nọkarịa mkpụrụ ụbọchị 100 nke butere nsogbu gbasara ihe akwụkwọ iwu kwuru.

Ugbua, o kwuru na ya ga-anọ mkpụrụ ụbọchị anọ mana ụfọdụ ụmụ Naịjirịa anaghị anabata ya bụ njem nke ọma.

Ọtụtụ n'ime ha rụtụrụ okwu yana mbụ ebe ọ gwara ndị ụlọ Chatham na London na ya agaghị eme njem ahụike maka na ya ga-arụzị ahụike na Naịjirịa.