Sleep Paralysis: Ọ bụ amusu maọbụ ajọ mmụọ na-apigide mmadụ n'ụra oge ụfodụ?

Aha onyonyo, Sleep paralysis: Aka amusu na ajọ mmụọ ndị ọzọ ọ na-adị na mpigide mmadụ n'ụra?
Sleep Paralysis: Ọ bụ amusu maọbụ ajọ mmụọ na-apigide mmadụ n'ụra oge ụfodụ?
Mgbe e biputara ya

Ụfọdụ oge, ndị mmadụ na-eche na o nwere mmụọ ọjọọ pigidere ha n'elu akwa ma ha na-ehi ụra, mana ndị ọkachamara sayensị na-akpọ ọnọdụ dị otu a 'sleep paralysis'.

Ọ na-eme ma nwoke, ma nwaanyị, nke mere ka ụfọdụ na-achọ enyemaka na be dibịa, nakwa ụlọ ekpere dị icheiche.

Mana BBC Igbo gakwuuru otu onye ọkacha mara ka ọ kọọrọ anyị nke ọma maka ọnọdụ a bụ 'sleep paralysis'.

Sleep paralysis: Aka amusu na ajọ mmụọ ndị ọzọ ọ na-adị na mpigide mmadụ n'ụra?
Skip Anyị chọrọ ịnụ olu gị: Enwetụla mgbe ụdị ihe a mere gị ? Pịa ebe a deturu anyị uche gị and continue readingAnyị chọrọ ịnụ olu gị: Enwetụla mgbe ụdị ihe a mere gị ? Pịa ebe a deturu anyị uche gị

End of Anyị chọrọ ịnụ olu gị: Enwetụla mgbe ụdị ihe a mere gị ? Pịa ebe a deturu anyị uche gị

Dkt Olajide Obembe bụ dọkịnta na-ahụ maka ọrịa isi nke bekee kpọrọ 'Psychiatristt', kọwaara BBC na ihe dị otu a bụ nsogbu nye ndị ụfọdụ.

Njirimara ya gụnyere na onye ahụ aghaghị enweike ikwu okwu, iweli aka maọbụ ụkwụ ya elu, n'ihi na ahụ ha ga-adị arọ.

Ọ sị na ihe ndị a mere ka ndị mmadụ na-eji anya egwu ele ya bụ ọnọdụ.

Dkt Obembe kọwara na ọtụtụ ndị mmadụ ekwenyeghị na nsogbu a bụ ihe ndị dọkịnta Bekee ga-agwọtanwụ, nke mere ha ji aga na be ndị dibịa na ụlọ ekpere dị icheiche.

Dkt Olajide Obembe

Ọ gara n'ihu kọwaa na ihe ọ chọpụtara bụ na ndị ụdị ihe a na-emekarị bụ ndị anaghị enwe ezi ezumike maọbụ ndị na-eme oke ndọlị maọbụ na-aṅụ caffeine tupu ha arahụ.

O nyere ndụmọdụ maka etu ndị mmadụ nwereike iji gbalahụ ya bụ nsogbu.

Ihe izizi o kwuru bụ ka ndị nwere ụdị nsogbu a, wepụ ihere, ma gaa hụ dọkịnta na-ahụ maka ọrịa isi.

Mmadụ hi ụra n'elu akwa
Nkọwa foto, "Njirimara ya gụnyere na onye ahụ aghaghị enweike ikwu okwu, iweli aka maọbụ ụkwụ ya elu, n'ihi na ha ga-adị arụ." Dkt Obembe, dọkịnta na-ahụmaka ọnọdụ isi mmadụ