Akụkọ kachasị n'abalị: Ndị Onitsha Main Market ekeleela gọọmentị
Akụkọ kachasị n'abalị a
Ndị ahịa Onitsha na-ekele gọọmentị

Ebe foto si, Getty Images
Ndị na-azụ ahịa na Main Market Onitsha ekwuola na ọ bụ ihe ọma na gọọmentị na-akwatu ụlọ dị iche iche na-egbochi ebe e si abata ahịa ha.
Ha kwukwara na ha chọrọ ka gọọmentị leba anya n'ụgwọ dị iche iche ndị na-abia ahịa Onitsha na-akwụ ndị omekome nọ n'ahịa ahụ.
Ndị uweojii ga-eme nyocha

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii Naịjirịa ekwuola na a ga-enyocha isi ndị na-achọ ọrụ n'aka ha ruru puku otu narị na iri atọ (130,000).
Ha kwuru na iwu nke a bụ maka ịchọpụta ndị na aṅụ ọgwụ ike n'ime ha.
Ha nwekwara olileanya na ha ga-ewe mmadụ puku isii (6000) n'ọrụ.
Ndị omeiwu na-akpọ ndị isi nchekwa

Ebe foto si, @NGRSenate
Ndị omeiwu ukwu Naịjirịa ekwuola na ha ga-akpọ ndị isi ọrụ nchekwa niile na Naịjirịa maka ịkọwa ebe ndị ji egbe egbu ọtụtụ mmadụ na mpaghara ugwu awụsa jiri nwete egbe.
Nwanyị mara onye ntaakụkọ aka ntị che na ọ bụ onye na-ere yabas
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Nwanyị mara onye ntaakụkọ aka ntị na Ghana bụ Hajia Fati, kwuru na o che na onye ntaakụkọ a bụ onye na-ere yabas.
Otu chịkọtara ndị ntaakụkọ na mba Ghana kwuru na ha nwere ike ikpe Fati n'ụlọ ikpe maka ihe a o mere.
Otu bọọlụ dị iche iche chọrọ inye Arsene Wenger ọrụ

Ebe foto si, Getty Images
Arsene Wenger ekwuola na otu dị Iche iche na-akpọ ya n'ọrụ onye nchịkọta otu bọọlụ dị iche iche.
Wenger chịrị Arsenal afọ iri abụọ na abụọ kwuru na onweghị otu ọ họpụtara ugbua.
Gee akụkọ anyị n'otu nkeji ebe a
Lee ihe nkịrị taa
































